Ii. Ndi-Eze

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25


Isi 9

Ma Elaisha, bú onye-amuma, kpọrọ otù onye nime umu ndi-amuma, si ya, Ke ihe-ọkiké n'úkwù-gi, were karama manu a n'aka-gi, je Remot-gilead.
2 Mb͕e i biara ebe ahu, gi hu Jihu nwa Jehoshafat nwa Nimshi anya n'ebe ahu, ba nime, me ka o bilie site n'etiti umu-nne-ya, me kwa ka ọ ba n'ime-ulo di n'ime-ulo.
3 Gi were kwa karama manu ahu, wukwasi ya n'isi-ya, si, Otú a ka Jehova siri, Etewom i manu ibu eze Israel. Meghe kwa uzọ, b͕alaga, eche-kwa-la eche.
4 Nwa-okorọbia ahu, ọbuná nwa-okorọbia ahu, bú onye-amuma, we jerue Remot-gilead.
5 Ọ bia, ma, le, ndi-isi usu-ndi-agha nanọdu ala; ọ si, Enwerem okwu igwa gi, onye-isi. Jihu we si, Ọ̀ bu onye nime ayi nile? Ọ si, Ọ bu gi, onye-isi.
6 O bilie, ba n'ulo; ọ wukwasi manu ahu n'isi-ya, si ya, Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Etewom i manu ibu eze ndi Jehova, bú Israel.
7 I gētib͕u kwa ulo Ehab, bú onye-nwe-gi, ka M'we bọ ọ́bọ̀ ọbara ndi-orùm, bú ndi-amuma, na ọbara ndi-orù nile nke Jehova, n'aka Jezebel.
8 Ulo nile nke Ehab gāla kwa n'iyì: M'gēbipu kwa n'aru Ehab nwa-nwoke ọ bula, na onye eb͕ochiri eb͕ochi na onye arapuru arapu n'Israel.
9 M'gēme kwa ulo Ehab ka ọ di ka ulo Jeroboam nwa Nebat, ka ọ di kwa ka ulo Beasha nwa Ahaija.
10 Nkita gēri kwa Jezebel n'òkè-ala-ubi Jezreel, ọ dighi kwa onye nēlì ya. O we meghe uzọ b͕alaga.
11 Jehu we pukute ndi-orù onye-nwe-ya: otù onye we si ya, Ùdo di kwa? gini mere onye a nke nāwi ara biakutere gi? Ọ si ha, Unu onwe-unu amawo nwoke ahu na nkpari-uka-ya.
12 Ha si, Ọ bu okwu-ugha; biko, gosi ayi. Ọ si, Otú a na otú a ka ọ gwaram, si, Otú a ka Jehova siri, Etewom i manu ibu eze Israel.
13 Ha we me ngwa, chiri, nwoke ọ bula uwe-ya, do ya n'okpuru ya n'elu ihe-nrigo, fùa opì-ike, si, Jihù bu eze.
14 Jihu nwa Jehoshafat nwa Nimshi we kekọta madu imegide Joram. (Ma Joram nēche Remot-gilead, ya onwe-ya na Israel nile, n'ihi Hazael, bú eze Siria:
15 ma Jehoram, bú eze, laghachiri ka agwọ ya nime Jezreel na ntib͕u nke ndi Siria tib͕uru ya, mb͕e o nēbuso Hazael, bú eze Siria, agha.) Jihu we si, Ọ buru na nka bu uche-unu, ka onye-nb͕apu ghara isi n'obodo a pua ije igosi ya nime Jezreel.
16 Jihu we nọdu n'ub͕ọ-ala, jerue Jezreel; n'ihi na Joram nēdina n'ebe ahu. Ma Ehazaia, bú eze Juda, ridatara ihu Joram.
17 Ma onye-nche nēguzo n'elu ulo-elu na Jezreel, ọ hu ìgwè ndi Jihu mb͕e ọ nābia, ọ si, Ìgwè madu ka m'nāhu. Jehoram we si, Were onye-inyinya, ziga izute ha, ya si kwa, Ùdo di kwa?
18 Onye-nnọkwasi-inyinya we je izute ya, si, Otú a ka eze siri. Ùdo di kwa? Jihu we si, Gini ka gi na udo nwekọrọ? chigharia ga n'azum. Onye-nche ahu we gosi, si, Onye-ozi-ayi biakutere ha, ma ọ lataghi.
19 O we zipu onye-nnọkwasi-inyinya nke-abua, ọ biakute ha, si, Otú a ka eze siri, Ùdo di kwa? Jihu we si, Gini ka gi na udo nwekọrọ? chigharia ga n'azum.
20 Onye-nche we gosi, si, Ọ biaruru ha aru, ma ọ latagh: ma odudu-inyinya di ka odudu-inyinya Jihu nwa Nimshi; n'ihi na o nēdu inyinya dika onye nāwi ara.
21 Jehoram we si, Jikwa ub͕ọ-ala. Ha we jikwa ub͕ọ-ala-ya. Jehoram, bú eze Israel, na Ehazaia, bú eze Juda, we pua, nwoke ọ bula n'ub͕ọ-ala-ya, ha we pua izute Jihu, we huta ya n'òkè-ala-ubi Nebot, bú onye Jezreel.
22 O rue, mb͕e Jehoram huru Jihu, na ọ siri, Ùdo di kwa, Jihu? Ọ si, Gini bu udo ahu, na mb͕e ikwa-iko Jezebel, bú nne-gi, na mb͕asi-ya nādi ọtutu?
23 Jehoram we chigharia aka-ya abua, b͕alaga, si Ehazaia, Aghughọ di, Ehazaia.
24 Jihu we dọtia uta-ya ka aka-ya ra, b͕ata Jehoram n'ab͕ata ogwe-aka-ya abua, àkú we si n'obi-ya puta, o we ruru ala n'ub͕ọ-ala-ya.
25 Jihu we si Bidka, bú onye-isi-agha-ya, Bulie ya, tubà n'òkè ubi Nebot, bú onye Jezreel: n'ihi na cheta na mu na gi nānọkwasi n'elu inyinya, ayi abua, nēso Ehab, bú nna-ya, mb͕e Jehova boro ya ibu a;
26 N'ezie ahuwom ọbara Nebot na ọbara umu-ya ndikom n'abali hnyahuru, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta; M'gākwughachi kwa gi n'òkè-ala-ubi nka, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. Ma ub͕u a bulie ya, tubà ya n'òkè-ala-ubi ahu, dika okwu Jehova si di.
27 Ma Ehazaia, bú eze Juda, huru ya, b͕alaga n'uzọ ulo ubi ab͕ara ogige. Jihu we chuso ya, si, Tib͕u-kwa-nu ya n'ub͕ọ-ala-ya. Ha we tib͕ue ya na nrigo Gua, nke di nso Ibleam. O we b͕alaga na Megido, nwua n'ebe ahu.
28 Ndi-orù-ya we me ka ub͕ọ-ala-ya būru ya jerue Jerusalem, ha we lìe ya n'ílì-ya, n'ebe elìri nna-ya-hà, n'obodo Devid.
29 Ma n'arọ nke-iri-na-otù nke Joram nwa Ehab ka Ehazaia malitere ibu eze Juda.
30 Jihu we biarue Jezreel, Jezebel we nu ya; ọ we de ihe-ichọ-nma n'anya-ya abua, me ka isi-ya di nma, lepu anya na window.
31 Mb͕e Jihu bara n'ọnu-uzọ-ama, nwayi ahu siri, Ùdo di kwa, Zimri, ob͕u onye-nwe-ya?
32 Jihu we welie iru-ya le anya na window, si, Ònye diyerem? ònye? Onozi abua ma-ọbu atọ we leputa anya n'ebe ọ nọ.
33 Ọ si, Tudanu ya. Ha we tuda ya: ufọdu nime ọbara-ya we fesa na mb͕idi, na n'inyinya-ya: ọ we zọkwasi ya ukwu.
34 Ọ bata, rie ihe ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, si, Biko, Lenu nwayi a aburu ọnu anya nke-ọma, lìe ya: n'ihi na nwa-nwayi eze ka ọ bu.
35 Ha we je ilì ya: ma ha achọtaghi ihe ọ bula di n'aru-ya ma-ọbughi okpokoro-isi-ya, na ukwu-ya abua, na ọbu-aka-ya abua.
36 Ha we biaghachi, gosi ya. Ọ si, Okwu Jehova ka ọ bu, nke O kwuru n'aka orù-Ya, bú Elaija onye Tisbe, si, N'òkè-ala-ubi Jezreel ka nkita gēri anu-aru Jezebel:
37 ozu Jezebel gādi kwa ka ǹsí-anu n'elu ubi n'òkè-ala-ubi Jezreel; ha ewe ghara isi, Nka bu Jezebel.