JJesus Ọkpara Chineke - Atọ n'Ime Otu


  • Chineke we si, Ka ayi kpua madu n'onyinyo-ayi, dika oyiyi-ayi si di: ka ha nwe kwa ike n'aru azù nke oké osimiri, na n'aru anu-ufe nke elu-igwe, na n'aru anu-ulo, na n'aru uwa nile, na n'aru ihe nile ọ bula nākpu akpu nke nākpu akpu n'elu uwa.
    Jenesis 1:26
  • Chineke we gọzie ha, si, Muanu ọmùmù, banu uba, juputa miri di n'oké osimiri nile, ka anu-ufe ba kwa uba n'uwa.
    Jenesis 3:22
  • Nuru, Israel; Jehova, bú Chineke-ayi, Jehova bu otù:
    Deuteronomi 6:4
  • N'ihi na amuworo ayi otù nwa, otù nwa-nwoke ka enyeworo ayi; ibu-onye-isi gādikwasi kwa n'ubu-ya: agākpọ kwa aha-ya Onye-ebube, Onye-ndum-ọdu, Chineke Nke bu Dike, Nna Nke bu Nna mb͕e nile ebighi-ebi, Onye-isi Udo.
    Aisaia 9:6
  • Unu onwe-unu bu ndi-àmàm, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, na orùm nke M'rọputara: ka unu we mara, kwerem, ghọta na Mu onwem bu Onye ahu: ọ dighi chi ọzọ eburu Mu onwem uzọ kpu, ma ọ bu nke gēsom n'azu.
    Aisaia 43:10
  • Otú a ka Jehova, Nke bu eze Israel na onye-nb͕aputa-ya, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, siri: Mu onwem bu onye mbu, Mu onwem bu kwa onye ikpe-azu; ọ dighi kwa Chineke ọ bula di ma ewezuga nání Mu onwem.
    Aisaia 44:6
  • Biakutenum nso, nurunu nka; site na mb͕e mbu ọ bughi na nzuzo ka M'kwuworo okwu; site na mb͕e ọdidi-ya, n'ebe ahu ka M'nọ: ma ub͕u a Onye-nwe-ayi Jehova ezitewom, mu na Mọ-Ya.
    Aisaia 48:16
  • Mọ nke Onye-nwe-ayi, bú Jehova, di n'arum; n'ihi na Jehova etewom manu izì ndi ewedara n'ala ozi ọma; O zitewom ikechi ọnyá ndi obi-ha tiwara etiwa, ikpọsa ọrira gwa ndi adọtara n'agha, na ikpọsa nmeghepu ulo-nkpọrọ gwa ndi ekere ab͕u;
    Aisaia 61:1
  • M'gākọ akukọ bayere ukpuru: Jeohva sirim, Ọkparam ka gi onwe-gi bu; Mu onwem amuwo gi ta.
    Abù Ọma 2:7
  • Ihe nke si n'ọnu Jehova puta nāsi onye-nwem, Nọdu ala n'aka-nrim, Rue mb͕e M'gēdo ndi-iro-gi ka ihe-nb͕akwasi diri ukwu-gi abua.
    Abù Ọma 110:1
  • Le, nwa-ab͕ọghọ ahu nāmaghi nwoke gādi ime, ọ gāmuta kwa Nwa-nwoke, Ha gākpọ kwa aha-Ya Immanuel; nke bu, ma asugharia ya, Chineke nọyere ayi.
    Matiu 1:23
  • Ma mb͕e emere Jisus baptism, ngwa ngwa O si na miri rigota: ma le, emeghere elu-igwe nye Ya, O we hu Mọ nke Chineke ka Ọ nēfeda dika ndùrù, nēbekwasi kwa Ya; ma le, olu sitere n'elu-igwe, si, Onye a bu Ọkparam M'huru n'anya, Onye ihe-Ya dim ezi nma.
    Matiu 3:16-17
  • Ya mere, ganu, me mba nile ka ha buru ndi nēso uzọm, nēme ha baptism bà n'aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mọ Nsọ:
    Matiu 28:19
  • Jisus zara, si, Nke-mbu bu, Nuru, Israel; Onye-nwe-ayi, bú Chineke-ayi, Onye-nwe-ayi bu otù:
    Mak 12:29
  • Ode-akwukwọ ahu we si Ya, Onye-ozizi, n'ezie I kwuru nke-ọma na Ọ bu otù; ọ dighi kwa chi ọzọ di ma-ọbughi Ya:
    Mak 12:32
  • Mọ-ozi ahu we za, si ya, Mọ Nsọ gābiakwasi gi, ike nke Onye kachasi ihe nile elu gēkpuchi kwa gi: n'ihi nka Ihe di nsọ nke i di ime Ya, agākpọ Ya Ọkpara Chineke.
    Luk 1:35
  • si, Nna, ọ buru na ọ di Gi nma, naram iko a: otú ọ di, ka eme ihe Gi onwe-gi nāchọ, ọ bughi ihe Mu onwem nāchọ.
    Luk 22:42
  • Na mbu ka Okwu ahu diri, Okwu ahu na Chineke dikwara, Okwu ahu buru kwa Chineke. Onye ahu na Chineke diri na mbu. Ekère ihe nile site n'aka-Ya; ekèghi kwa otù ihe ọ bula nke ekèworo ma Ọ nọghi ya.
    Jọn 1:1-3
  • Okwu ahu we ghọ anu-aru, bú madu, O we biri n'etiti ayi, (ayi kiri-kwa-ra otuto-Ya, bú otuto dika otù nwa-nwoke amuru nání ya nānata n'aka nna-ya), O juputara n'amara na ezi-okwu.
    Jọn 1:14
  • Ọ dighi onye ọ bula huworo Chineke mb͕e ọ bula; Chineke, bú Ọkpara amuru nání Ya, Onye nādabere n'obì Nna-Ya, Onye ahu kọrọ Ya nye madu.
    Jọn 1:18
  • Chineke bu Mọ: ndi nākpọ kwa isi ala nye Ya aghaghi ikpọ isi ala nime mọ na ezi-okwu.
    Jọn 4:24
  • Ya mere n'ihi nka ka ndi-Ju nāchọ kari uzọ ib͕u Ya, n'ihi na ọ bughi nání na Ọ nēmebi ubọchi-izu-ike, kama Ọ nākpọ kwa Chineke Nna nke aka Ya, nēme ka Ya onwe-ya na Chineke ra.
    Jọn 5:18
  • Ya mere M'siri unu, na unu gānwu na nmehie nile unu: n'ihi na ọ buru na unu ekweghi na Mu onwem bu Ya, unu gānwu na nmehie nile unu.
    Jọn 8:24
  • Jisus siri ha, N'ezie, n'ezie, asim unu, Mb͕e akāmughi Abraham Mu onwem di.
    Jọn 8:58
  • Mu onwem na Nnam bu otù.
    Jọn 10:30
  • Ndi-Ju zara Ya, si, Ọ bughi n'ihi ọlu ọma ka ayi nātu Gi nkume, kama ọ bu n'ihi nkwulu; n'ihi kwa na Gi onwe-gi, ebe I bu madu, I nēme Onwe-gi Chineke.
    Jọn 10:33
  • Jisus si ya, Mu onwem bu uzọ, na ezi-okwu, na ndu: ọ dighi onye ọ bula nābiakute Nnam, ma-ọbughi site na Mu.
    Jọn 14:6
  • Jisus si ya, Ogologo oge di otú a ka Mu na gi nọ, ma ì mataghm, Filip? onye huworom anya ahuwo Nnam anya; gì onwe-gi si aṅa si, Gosi ayi Nnam ahu? Ì kweghi na Mu onwem nọ nime Nnam, Nnam nọ kwa nimem? okwu Mu onwem nāgwa unu ekwughi m n'Onwem: ma Nnam Nke nēbi nimem nālu ọlu-Ya. Kwerenum na Mu onwem nọ nime Nnam, Nnam nọ kwa nimem: ma ọ bughi, kwerenum n'ihi ọlum onwe-ha.
    Jọn 14:9-11
  • Mu onwem gēkpe-kwa-ra Nnam, Ọ gēnye kwa unu Onye-nkasi-obi ọzọ, ka Ọ nọyere unu rue mb͕e ebighi-ebi, bú Mọ nke ezi-okwu: Onye uwa nāpughi inara; n'ihi na ọ dighi-ahu ya, ọ dighi-ama kwa Ya: unu onwe-unu mara Ya; n'ihi na Ya na unu nānọgide, Ọ gānọ kwa nime unu.
    Jọn 14:16-17
  • Ma Onye-nkasi-obi ahu, bú Mọ Nsọ, Onye Nnam gēzite n'aham, Onye ahu gēzí unu ihe nile, me kwa ka unu cheta okwu nile Mu onwem gwara unu.
    Jọn 14:26
  • Unu nuru na Mu onwem siri unu, Anamala, biakute kwa unu. Ọ buru na unu hurum n'anya, unu gāṅuwori ọṅu, n'ihi na anamagakuru Nnam: n'ihi na Nnam ka Mu onwem uku.
    Jọn 14:28
  • Ma mb͕e ọ bula Onye-nkasi-obi ahu gābia, Onye Mu onwem gēsi n'ebe Nnam nọ zitere unu, bú Mọ nke ezi-okwu, Onye si na Nnam puta, Onye ahu gāb͕aram àmà:
    Jọn 15:26
  • Ma nka bu ndu ebighi-ebi ahu, ka ha mara Gi, Nke nání Gi bu ezi Chineke, mara kwa Onye I zitere, bú Jisus Kraist.
    Jọn 17:3
  • Otuto nke I nyeworom ka Mu onwem nyewo-kwa-ra ha; ka ha we buru otù, dika Ayi onwe-ayi bu otù; Mu onwem nime ha, Gi onwe-gi kwa nimem, ka ewe me ka ha buru ndi zuworo okè ibu otù; ka uwa we mara na Gi onwe-gi ziterem, na I hu-kwa-ra ha n'anya, dika I hurum n'anya.
    Jọn 17:22-23
  • Onye akaworo ibu Ọkpara Chineke n'ike, dika Mọ nke idi-nsọ si di, site na nbilite-n'ọnwu nke ndi nwuru anwu; bú Jisus Kraist Onye-nwe-ayi,
    Ndi Rom 1:4
  • asi na ọ bu ezie na Chineke bu otù, Onye gāgu ndi obibì-úgwù na ndi ezi omume site n'okwukwe, were kwa okwukwe ahu gua ndi ebìghi-úgwù na ndi ezi omume.
    Ndi Rom 3:30
  • Ma ọ buru na Mọ nke Onye ahu Nke mere ka Jisus si na ndi nwuru anwu bilie nēbi nime unu, Onye ahu Nke mere ka Kraist Jisus si na ndi nwuru anwu bilie gēsite kwa n'aka Mọ-Ya Nke nēbi nime unu me ka aru-unu nke puru inwu anwu di ndu.
    Ndi Rom 8:11
  • kama dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ihe anya nāhughi, nke nti nānughi kwa, Nke nābàghi kwa n'obi madu, Ka ha ra, bú ihe Chineke doziri ndi huru Ya n'anya. Ma ọ bu ayi onwe-ayi ka Chineke kpughere ha site n'aka Mọ Nsọ: n'ihi na Mọ Nsọ nēnyocha ihe nile, ọbuná ihe nile di omimi nke Chineke.
    I. Ndi Kọrint 2:9-10
  • Ùnu amataghi na unu bu ulo nsọ Chineke, Mọ nke Chineke bi kwa nime unu?
    I. Ndi Kọrint 3:16
  • ma n'ebe ayi nọ otù Chineke di, bú Nna, Onye ihe nile sitere na Ya, Onye ayi onwe-ayi di-kwa-ra Ya; otù Onye-nwe-ayi di kwa, bú Jisus Kraist, Onye ihe nile sitere n'aka-Ya, ayi onwe-ayi site-kwa-ra n'aka-Ya.
    I. Ndi Kọrint 8:6
  • Ma nkpuru nke Mọ Nsọ bu ihu-n'anya, ọṅù, udo, ogologo-ntachi-obi; obi-ọma, idi-nma, ikwesi-ntukwasi-obi, idi-nwayọ, imerū-ihe-n'ókè: ọ dighi iwu nēmegide ihe nile di otú a.
    Ndi Galetia 5:22-23
  • n'ihi na ayi abua sitere n'aka-Ya nwe nkpọbata-ayi n'ebe Nna nọ nime otù Mọ Nsọ.
    Ndi Efesọs 2:18
  • Otù aru di, otù Mọ di kwa, dika akpọ-kwa-ra unu nime otù olile-anya nke ọkpukpọ-unu; otù Onye-nwe-ayi di, otù okwukwe di, otù baptism di, otù Chineke na Nna nke ayi nile di, Onye bu isi ayi nile, Onye site-kwa-ra n'aka ayi nile nālu ọlu, Onye nānọ kwa nime ayi nile.
    Ndi Efesọs 4:4-6
  • Amara diri unu na udo nke si n'aka Chineke, bú Nna-ayi, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist puta.
    Ndi Filipai 1:2
  • Nwenu uche a nime onwe-unu, nke di kwa nime Kraist Jisus: Onye, ọ bu ezie na Ọ diri n'udi nke Chineke na mbu, ma Ọ gughi ya n'ihe O gējidesi ike, bú ira ka Chineke, kama O mere Onwe-ya ihe-efu, n'inara udi nke orù, ewe me Ya n'oyiyi nke madu; ebe ahuru Ya ka Ọ di ka madu n'oyiyi-Ya, O wedakwara Onwe-ya, we buru Onye nāṅa nti rue ọnwu, bú ọnwu nke obe.
    Ndi Filipai 2:5-8
  • Onye bu onyinyo nke Chineke ahu Nke anāpughi ihu anya, buru kwa onye eburu uzọ mu n'ihe nile ekère èkè; n'ihi na nime Ya ka ekère ihe nile, nke di nime elu-igwe na nke di n'elu uwa, ihe apuru ihu anya na ihe anāpughi ihu anya, ma ọ bu oche-eze, ma-ọbu ibu-ndi-nwe-madu, ma-ọbu ibu-ndi-isi, ma-ọbu ichi-isi; esitewo n'aka-Ya kè ihe nile, ekèwo-kwa-ra Ya ihe nile; Ya onwe-ya bū kwa ihe nile uzọ, ọ bu kwa nime Ya ka ihe nile nēguzokọ n'otù.
    Ndi Kọlọsi 1:15-17
  • n'ihi na nime Ya ka ozuzù nile nke ihe Chineke bu nēbigide nēwere aru madu,
    Ndi Kọlọsi 2:9
  • Ma Onye-nwe-ayi duzie obi-unu bà n'ihunanya nke Chineke, bà kwa na ntachi-obi nke Kraist-ayi.
    2 Thessalonians 3:5
  • N'ihi na otù Chineke di, otù Onye-ob͕ub͕o di kwa n'ab͕ata Chineke na madu, Onye Ya onwe-ya bu madu, bú Kraist Jisus,
    I. Timọti 2:5
  • Onye zọputara ayi, were kwa ọkpukpọ di nsọ kpọ ayi, ọ bughi dika ọlu-ayi si di, kama dika ihe Ya onwe-ya zubere, na amara-Ya, si di, nke enyere ayi nime Kraist Jisus mb͕e oge ebighi-ebi akērughi,
    II. Timọti 1:9
  • nēche olile-anya ahu di ngọzi na ngosi nke ebube nke Chineke uku ahu, Nke bu kwa Onye-nzọputa-ayi, Jisus Kraist;
    Taitọs 2:13
  • Onye, ebe Ọ bu nnwupu nke ebube-Ya na onyinyo nke udi-Ya, ebe O nēbu kwa ihe nile site n'okwu nke ike-Ya, mb͕e Ọ sachasiri nmehie nile ayi, O we nọdu n'aka-nri nke Idi-uku ahu di n'elu;
    Ndi-Hibru 1:3
  • ma Ọ nēkwu ihe bayere Ọkpara ahu, si, Oche-eze-gi, Chineke, nādiru mb͕e nile ebighi-ebi; Nkpa-n'aka-eze nke izi-ezi ka nkpa-n'aka nke ala-eze-Gi bu kwa.
    Ndi-Hibru 1:8
  • ọ̀bara Kraist, Onye sitere n'aka Mọ ebighi-ebi che Onwe-ya nātaghi uta n'iru Chineke, gēsi aṅa ghara ime akọ-na-uche-ayi ka ọ di kari ọcha nke-uku ri nne pua n'ọlu nile nwuru anwu ikpere Chineke di ndu?
    Ndi-Hibru 9:14
  • Jisus Kraist di otù aka ahu nnyahu na ta, ma rukwa mb͕e nile ebighi-ebi.
    Ndi-Hibru 13:8
  • Pita, onye-ozi nke Jisus Kraist, nēdegara unu akwukwọ, bú ndi arọputaworo ndi bi dika ọbìa n'etiti Nb͕asa ahu nime Pọntọs, Galetia, Kapadọsia, Esia, na Bitinia, ndi arọputaworo dika ọmuma-ihe Chineke buru uzọ mara si di, nime ido-nsọ nke Mọ Nsọ, ka unu we ṅa Jisus Kraist nti, ka ewe fesa kwa unu ọbara-Ya: Ka eme ka amara bara unu uba, ya na udo.
    I. Pita 1:1-2
  • ọ bu ihe ayi huworo, nu kwa, ka ayi nākọkwara unu, ka unu onwe-unu we so kwa ayi nwekọ ya: ma nnwekọ-ayi bu kwa nke ayi soro Nna-ayi, so kwa Ọkpara-Ya Jisus Kraist, nēnwekọ:
    I. Jọn 1:3
  • Ọ bu kwa Mọ Nsọ bu Onye nāb͕a àmà, n'ihi na Mọ ahu bu ezi-okwu. N'ihi na ndi ahu ndi nāb͕a àmà di atọ, bú Mọ ahu, na miri ahu, na ọbara ahu: ha atọ diri ime otù ihe ahu.
    I. Jọn 5:7-8
  • Ma ayi matara na Ọkpara Chineke abiawo, nye kwa ayi uche, ka ayi we mara Onye-ezi-okwu ahu, ayi nọ kwa nime Onye-ezi-okwu ahu, nime Ọkpara-Ya, bú Jisus Kraist. Nka bu ezi Chineke, na ndu ebighi-ebi.
    I. Jọn 5:20
  • Mu onwem bu Alfa ahu na Omega ahu, ka Onye-nwe-ayi Chineke kwuru, bú Onye nādi adi, Onye di-kwa-ri, Onye nābia kwa, Onye puru ime ihe nile.
    Nkpugh 1:8