Nzọpụta anyị


  • si, N'ezie asim unu, Ọ buru na unu echigharighi, bia di ka umu-ntakiri, unu agaghi-abà n'ala-eze elu-igwe ma-ọli. - 
    Matiu 18:3
  • Ma ka ha ra, bú ndi nara Ya, ha ka O nyere ike ighọ umu Chineke, bú ndi kwere n'aha-Ya: - 
    Jọn 1:12
  • Jisus zara, si ya, N'ezie, n'ezie, asi mi, Ọ buru na amughi madu ọzọ, ọ pughi ihu ala-eze Chineke anya. -
    Jọn 3:3
  • N'ihi na Chineke huru uwa n'anya otú a, na Ọ nyere ọbuná Ọkpara Ọ muru nání Ya, ka onye ọ bula nke kwere na Ya we ghara ila n'iyì, kama ka o nwe ndu ebighi-ebi. - 
    Jọn 3:16
  • HOnye kwere n'Ọkpara ahu nwere ndu ebighi-ebi; ma onye nēkweyeghi Ọkpara ahu agaghi-ahu ndu, kama iwe Chineke nānọgide n'aru-ya. - 
    Jọn 3:36
  • Mu onwem nēnye kwa ha ndu ebighi-ebi; ha agaghi-ala kwa n'iyì ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi, ọ dighi kwa onye ọ bula gānapu ha n'akam. - 
    Jọn 10:28
  • Jisus si ya, Mu onwem bu uzọ, na ezi-okwu, na ndu: ọ dighi onye ọ bula nābiakute Nnam, ma-ọbughi site na Mu. - 
    Jọn 14:6
  • Ha we si, Kwere n'Onye-nwe-ayi Jisus, agāzọputa kwa gi, gi onwe-gi na èzí-na-ulo-gi. - 
    Ọlu Ndi-Ozi 16:31
  • n'ihi na madu nile emehiewo, ha adighi-eru kwa otuto Chineke;
    Ndi Rom 3:23
  • N'ihi na ugwọ-ọlu nke nmehie bu ọnwu; ma onyinye-amara nke Chineke bu ndu ebighi-ebi nime Kraist Jisus Onye-nwe-ayi.- 
    Ndi Rom 6:23
  • na ọ buru na i gēwere ọnu-gi kwuputa Jisus na Ọ bu Onye-nwe-ayi, ọ buru kwa na i gēwere obi-gi kwere na Chineke mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, agāzọputa gí: n'ihi na anēji obi kwere rue ezi omume; anēji kwa ọnu kwuputa rue nzọputa. n'ihi na, Onye ọ bula nke gākpọku aha Onye-nwe-ayi, agāzọputa ya.- 
    Ndi Rom 10:9,10,13
  • a mere ọ buru na onye ọ bula di nime Kraist, ọ bu onye ekère ọhu: ihe ochie agasiwo; le, ha aghọwo ihe ọhu. - 
    Ndi Efesọs 5:17
  • n'ihi na ọ bu amara ka ejiworo zọputa unu, site n'okwukwe; nka esiteghi kwa n'onwe-unu: ọ bu onyinye Chineke: o siteghi n'ọlu, ka onye ọ bula we ghara inya isi. -
    Ndi Efesọs 2:8,9
  • O siteghi n'ọlu di iche iche aluru n'ezi omume, nke ayi onwe-ayi luru, zọputa ayi, kama dika ebere-Ya si di, site n'ọsisa nke imu-ọzọ na nke ime ọhu nke Mọ Nsọ nēme, - 
    Taitọs 3:5
  • Ọ fọduru ihe ntà ka m'si na eji kwa ọbara eme ihe nile ka ha di ọcha, dika iwu-ayi si di, ọ buru kwa na nwusì ọbara adighi nb͕aghara nmehie adighi. - 
    Ndi-Hibru 9:22
  • Ọ buru na ayi ekwuputa nmehie-ayi, Ọ bu Onye kwesiri ntukwasi-obi, buru kwa Onye ezi omume, ka O we b͕aghara ayi nmehie-ayi, sachapu kwa ayi ajọ omume nile. - 
    I. Jọn 1:9
  • Le, anameguzo n'ọnu-uzọ, nāku kwa aka: ọ buru na onye ọ bula anu olum, meghe kwa uzọ, M'gābakute ya, so kwa ya ri nri-anyasi, ya onwe-ya gēsokwam rie. -
    Nkpugh 3:20