Iguzogide Ekwensu


  • Ha gātu kwa egwu aha Jehova site n'Ọdida-anyanwu, tu kwa egwu ebube-Ya site n'ọwuwa anyanwu: mb͕e onye-nkpab͕u gābata dika miri-iyi, Mọ nke Jehova ganēbuli ọkọlọtọ imegide ya.
    Aisaia 59:19
  • Owe kpọ ndikom iri na abua ahu ndi nēso uzọ-Ya ka ha biakute Ya, O nye ha ike n'ebe ndi-mọ nādighi ọcha nọ, ichupu ha, na igwọ ọria nile di iche iche na nriaria nile di iche iche.
    Matiu 10:1
  • M'gēnye gi nkpisi-ugodi nke ala-eze elu-igwe: ihe ọ bula i gēke kwa ab͕u n'elu uwa, agēke ya n'elu-igwe: ihe ọ bula i gātọpu kwa ab͕u n'elu uwa, agātọpu ya n'elu-igwe.
    Matiu 16:19
  • Ma mb͕e O chighariri, hu ndi neso uzọ-Ya, Ọ bara Pita nba si, Ga n'azum, Setan: n'ihi na i dighi-atukwasi uche-gi n'ihe Chineke, kama ọ bu n'ihe madu.
    Mak 8:33
  • Owe kpọkọta ndi-ozi iri na abua ahu, nye ha ike na ichi-isi n'ebe ndi-mọ ọjọ nile nọ, na igwọ ọria di iche iche.
    Luk 9:1
  • Ọgu ndikom atọ na iri ahu were ọṅù lata, si, Onye-nwe-ayi, ọbuná ndi-mọ ọjọ ka anēdo n'okpuru ayi n'aha-Gi.
    Luk 10:17
  • Le, enyewom unu ike izọkwasi agwọ na akpi ukwu, na imegide ike onye-iro-unu nile: ọ dighi kwa ihe ọ bula gēmeru unu aru ma-ọli.
    Luk 10:19
  • (n'ihi na ihe-agha nke ibu-agha-ayi abughi nke anu-aru, kama ha sitere na Chineke bu ihe puru ikwada ebe ewusiri ike); ebe ayi nēweda ihe anātule n'obi, na ihe nile ọ bula di elu nke eweliri elu imegide ọmuma Chineke, ayi nādọta kwa ihe nile ọ bula anēchèputa n'agha iṅa nti Kraist;
    II. Ndi Kọrint 10:4,5
  • enye-kwa-la ekwensu uzọ.
    Ndi Efesọs 4:27
  • Nke fọduru, menu onwe-unu ka unu di ike nime Onye-nwe-ayi, ya na nime idi-ike nke ike-Ya. Yikwasinu ihe-agha nile nke Chineke, ka unu we pu iguzogide ihe nile ekwensu nēzuputa.
    Ndi Efesọs 6:10, 11
  • Nwenu anya-udo, nēchenu nche: onye ahu nke nēkuru unu ga ikpé, bú ekwensu, dika ọdum nāb͕ọ uja, ọ nējeghari, nāchọ onye o gēlomi: ma nēguzogidenu ya, n'ihi na unu di ike n'okwukwe-unu, ebe unu matara na anēmezu otù ahuhu ahu n'aru ndi bu òtù umu-nna-unu ndi nọ n'uwa.
    I. Pita 5:8,9
  • onye nēme nmehie si n'ekwensu puta; n'ihi na ekwensu nēmehie site na mbu. Ihe eji me ka Ọkpara Chineke puta ìhè bu nka, ka O we la ọlu nile nke ekwensu n'iyì.
    I. Jọn 3:8
  • Umu-ntakirim, unu onwe-unu bu ndi siri na Chineke puta, unu emeriwo kwa ha: n'ihi na Onye ahu Nke nọ nime unu ka onye ahu nke nọ n'uwa uku.
    I. Jọn 4:4