Ajọ omume


  • Nwoke ọ bula nke ya na nwoke nēdina, dika nwoke na nwayi nēdina, ihe-árú ka ha abua meworo: aghaghi ime ka ha nwua; ọbara-ha gādikwasi ha.
    Levitikọs 20:13
  • N'ihi na esi n'elu-igwe kpughe iwe Chineke imegide asọpurughi-Chineke na ajọ omume nile nke madu, ndi nēb͕ochi ezi-okwu n'ajọ omume; n'ihi na ihe apuru imata bayere Chineke nāputa ìhè nime ha; n'ihi na Chineke mere ka ọ putara ha ìhè. N'ihi na ihe-Ya anya nāhughi site n'òkìkè uwa ka anāhu nke-ọma, ebe anāghọta ha site n'ihe nile ekère èkè, bú ike ebighi-ebi Ya na udi-Chineke-Ya; ka ha ghara inwe ngọpu: n'ihi na, ọ bu ezie na ha mara Chineke, ma ha enyeghi Ya otuto dika Chineke, ha ekeleghi kwa Ya; kama emere ha ihe-efu n'ihe nile ha nātule n'obi-ha, obi-ha nke nēnweghi nghọta b͕a-kwa-ra ọchichiri. Mb͕e ha nēkwu na ha bu ndi mara ihe, ha we ghọ ndi-nzuzu, we were ebube nke Chineke anāpughi imebi b͕anwere oyiyi nke onyinyo madu apuru imebi, na nke anu-ufe na anu ukwu anọ na ihe nākpu akpu di iche iche. N'ihi ya Chineke rara ha nye n'aka adighi-ọcha n'ihe ọjọ nile nāgu obi-ha, ka ewe me aru-ha ihe-ihere n'etiti ha: ebe ha were ezi-okwu nke Chineke b͕anwere ugha-ha, ha we sọpuru nēkpe-kwa-ra ihe ekère èkè kama Onye kère èkè, Onye agọziworo ebighi-ebi. Amen. N'ihi nka Chineke rara ha nye n'aka agu ihe-ihere: n'ihi na ndinyom-ha were nwanyi ha bu site n'ọmumu b͕anwere ihe nēmegide ka esi mu ha: otú a ndikom rapu-kwa-ra otú anēme nwanyi site ka esi mu ya, we re ọku n'agu-ha n'aru ndikom-ibe-ha, ndikom nāluputa ihe nādighi nma n'anya n'aru ndikom, nānara kwa nime onwe-ha ugwọ-ọlu ahu nke njehie-ha nke ha nāghaghi inara. Dika ha juru inọgide n'imazu Chineke, Chineke ra-kwa-ra ha nye n'aka uche ajuru aju, ime ihe ahu nile nēkwesighi;
    Ndi Rom 1:18-28
  • Ma-ọbu ùnu amataghi na ndi ajọ omume agaghi-eketa ala-eze Chineke? Unu ekwela ka eduhie unu: ndi nākwa iko, ma-ọbu ndi nēkpere arusi, ma-ọbu ndikom nākwa iko, bú ndi nwere nwunye, ma-ọbu ndikom nēme dika ndinyom, ma-ọbu ndikom nēmeru onwe-ha n'aru ndikom, ma-ọbu ndi-ori, ma-ọbu ndi-anya-uku, ma-ọbu ndi nāṅubiga manya ókè, ma-ọbu ndi-nkwutọ, ma-ọbu ndi nāpunara madu ihe, ha agaghi-eketa ala-eze Chineke. Otú a ka ufọdu n'etiti unu di-kwa-ri: ma unu sachara onwe-unu, ma edoro unu nsọ, ma aguru unu na ndi ezi omume n'aha Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, ya na nime Mọ nke Chineke-ayi.
    I. Ndi Kọrint 6:9-11
  • ka unu tupu madu ochie unu, nke nēmebi emebi n'uzọ agu nke aghughọ, dika ibi-obi-unu na mbu si di; ka eme kwa ka unu di ọhu na mọ nke uche-unu, ka unu yikwasi kwa madu ọhu unu, nke ekère dika Chineke chọrọ nime ezi omume na idi-ọcha nke ezi-okwu ahu.
    Ndi Efesọs 4:22-24
  • Ma ikwa-iko, na adighi-ọcha nile, ma-ọbu anya-uku, ka aghara ikpọ ọbuná aha-ya n'etiti unu, dika o kwesiri ndi nsọ;
    Ndi Efesọs 5:3
  • Ka ilu-di-na-nwunye buru ihe anāsọpuru n'etiti unu nile, ka ihe-ndina-unu buru kwa ihe adighi-emeru emeru: n'ihi na Chineke gēkpe ndi nākwa iko ikpé, ha na ndi nākwa iko, bú ndikom nwere nwunye na ndinyom nwere di.
    Ndi-Hibru 13:4