Nkewa


  • na Mizpa, n'ihi na ọ siri, Ka Jehova che nche n'etiti mu na gi, mb͕e agēzopu ayi, otù onye n'ebe ibe-ya nọ.
    Jenesis 31:49
  • Ekpere bayere nwata nka ka m'kpere; Jehova we nyem aririọm nke m'riọrọ n'aka-Ya: ọzọ kwa, mu onwem emewo ka ariọtara ya Jehova; ubọchi nile ọ nādi ndu ya onwe-ya bu onye ariọtaworo nye Jehova. Ilai we kpọ isi ala nye Jehova n'ebe ahu.
    I. Samuel 1:27, 28
  • Ọzọ, asi na ejem ije na ndagwurugwu onyinyo ọnwu, M'gaghi-atu egwu ihe ọjọ ọ bula; n'ihi na Gi onwe-gi nọyerem: Ndele-Gi na nkpa-n'aka-Gi, ha onwe-ha nākasim obi.
    Abù Ọma 23:4
  • N'ihi na nnam na nnem arapuwom, Ma Jehova gēkubatam.
    Abù Ọma 27:10
  • Jehova nọ nso ndi obi-ha tiwara etiwa, Ọ nāzọputa kwa ndi azọpiaworo nime mọ-ha.
    Abù Ọma 34:18
  • Ọ bu onye nēme ka ndi obi-ha tiwara etiwa diri ndu, Ọ nēkechi kwa ihe-nb͕u nile ha.
    Abù Ọma 147:3
  • Ọtutu miri apughi imenyu ihu-n'anya, Osimiri nile agaghi-erikpu kwa ya: Ọ buru na onye ọ bula gēnye àkù nile nke ulo-ya n'ihi ihu-n'anya, Agēleda ya anya nke-uku.
    Abù Nke Abù 8:7
  • M'gaghi-arapu unu ka umu-nb͕ei: agajem ibiakute unu.
    Jọn 14:18
  • N'ihi na anamagu na ahuhu nile nke oge di ub͕u a ekwesighi ka ekwuta ha ma ele ebube ahu anya, bú nke agaje ikpughe n'ebe ayi nọ.
    Ndi Rom 8:18
  • Onye nākasi ayi obi na nkpab͕u-ayi nile, ka ayi we pu isite na nkasi-obi nke Chineke ji kasi ayi onwe-ayi obi kasie ndi ahu obi ndi nọ na nkpab͕u ọ bula.
    II. Ndi Kọrint 1:4
  • Otú ọ di, ihe ọ bula nke baram urù, ihe ndia ka m'guru n'ihe-iyì n'ihi Kraist-ayi. E, tukwasi kwa, anamagu kwa ihe nile n'ihe-iyì n'ihi ọkika nke ọmuma Kraist Jisus, bú Onye-nwem: Onye m'yiri iyì ihe nile nkem n'ihi Ya, anamagu kwa ha n'ihe-nkpofu, ka m'we rita Kraist n'urù,
    Ndi Filipai 3:7,8
  • Ma ayi achọghi ka unu ghara imara ihe bayere ndi nāda n'ura ọnwu, umu-nna-ayi; ka o we ghara iwuta unu, ọbuná dika ọ nēwuta ndi fọduru, ndi nēnweghi olile-anya.
    I. Ndi Tesalọnaika 4:13
  • N'ihi na ntachi-obi di unu nkpà, ka ọ gābu, mb͕e unu meworo ihe Chineke nāchọ, ka unu we nata nkwa ahu.
    Ndi-Hibru 10:36
  • ka nnwaputa nke okwukwe-unu, ebe ọ dikariri ọla-edo oké ọnu-ahia nke-uku, bú ọla-edo nke nāla n'iyì, ọ bu ezie na anēji ọku nwaputa ya, ka ewe hu nnwaputa ahu na ọ nēweta otuto na ebube na nsọpuru nime nkpughe nke Jisus Kraist:
    I. Pita 1:7