Nganga na mpako


  • Unu ekwula ọtutu okwu di elu elu; Ka oké okwu ghara isi n'ọnu-unu puta: N'ihi na Chineke nke ọmuma-ihe ka Jehova bu, Anēsite kwa n'aka-Ya atù omume.
    I. Samuel 2:3
  • Eze Israel we za, si, Kwuenu, si ya, Ka onye nēke ekike-agha-ya ghara ito onwe-ya dika onye nēkepu ya.
    I. Ndi-Eze 20:11
  • Nganga bia, nlelì abia kwa: Ma n'ebe ndi di ume-ala n'obi nọ ka amam-ihe di.
    Ilu 11:2
  • Nání na nganga ka ilu-ọ̀gù nāputa: Ma n'aka ndi aduworo ọdu ka amam-ihe di.
    Ilu 13:10
  • Ulo ndi-npako ka Jehova gēropu: Ma Ọ gēme ka ókè-ala nwanyi di-ya nwuru guzosie ike.
    Ilu 15:25
  • Ihe-árú n'anya Jehova ka onye ọ bula bu nke obi-ya di elu: Site n'aka rue aka, agaghi-agu ya n'onye nēmeghi ihe ọjọ.
    Ilu 16:5
  • N'iru ntipia ka npako nāga, Ọ bu kwa n'iru isu-ngọngọ ka idi-elu nke mọ madu nāga.
    Ilu 16:18
  • Uzọ di nke ziri ezi n'iru madu, Ma nsọtu-ya bu uzọ nile nke ọnwu.
    Ilu 16:25
  • N'iru ntipia ka obi madu di elu, Ọ bu kwa n'iru nsọpuru ka obi ume-ala nāga.
    Ilu 18:12
  • Ọkpukpu-ọlu nke obi ume-ala na egwu Jehova Bu àkù, na nsọpuru, na ndu.
    Ilu 22:4
  • Npako madu gēme ka ọ di ala: Ma onye mọ-ya di ala nējidesi nsọpuru ike.
    Ilu 29:23
  • N'ihi na ihe nile ndia ka akam meworo, ihe ndia nile ewe di, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta: ma onye a ka M'gēlegide, ọbuná onye ewedara n'ala nke etib͕u-kwa-ra mọ-ya etib͕u, onye nāma kwa jijiji n'okwum.
    Aisaia 66:2
  • N'ihi na onye ọ bula nke nēweli onwe-ya elu, agēweda ya; ọzọ, onye nēweda onwe-ya, agēweli ya elu.
    Luk 14:11
  • Ya mere, onye nēchè na o nēguzo, ya lezi anya ka ọ ghara ida.
    I. Ndi Kọrint 10:12
  • Ma nkpuru nke Mọ Nsọ bu ihu-n'anya, ọṅù, udo, ogologo-ntachi-obi; obi-ọma, idi-nma, ikwesi-ntukwasi-obi, idi-nwayọ, imerū-ihe-n'ókè: ọ dighi iwu nēmegide ihe nile di otú a.
    Ndi Galetia 5:22,23
  • unu emela ihe ọ bula n'uzọ ikpa-iche-iche ma-ọbu n'uzọ ichọ otuto efu, kama n'obi di ume-ala nāguritanu ibe-unu na ndi ka unu onwe-unu nma; unu nile n'otù n'otù elela ihe nke aka unu anya, kama unu nile n'otù n'otù le kwa ihe nke madu-ibe-unu anya. Nwenu uche a nime onwe-unu, nke di kwa nime Kraist Jisus:
    Ndi Filipai 2:3-5
  • Ma Ọ nēnye kari amara. N'ihi nka ihe edeworo n'akwukwọ nsọ si, Chineke nēdo Onwe-ya imegide ndi-npako, ma Ọ nēnye ndi di ume-ala n'obi amara.
    Jemes 4:6
  • Wedanu onwe-unu n'iru Onye-nwe-ayi, Ọ gēweli kwa unu elu.
    Jemes 4:10
  • Otú ahu, unu ndi bu nwata, donu onwe-unu n'okpuru ndi-okenye. Ma unu nile were obi di ume-ala ke onwe-unu dika ákwà, ijerita ibe-unu ozi: n'ihi na Chineke nēdo Onwe-ya imegide ndi-npako, ma Ọ nēnye ndi di ume-ala n'obi amara. Ya mere wedanu onwe-unu n'okpuru aka di ike nke Chineke, ka O we welie unu elu n'oge nke Ya; nātukwasinu Ya ncheb͕u nile unu nēcheb͕u onwe-unu, n'ihi na ihe nile bayere unu nēmetu Ya n'obi.
    I. Pita 5:5-7