Nkwuwa okwu na nkwenye


  • M'gēkwu kwa okwu bayere ihe-àmà-Gi nile n'iru ndi-eze, Ihere agaghi-emekwam.
    Abù Ọma 119:46
  • Egwu madu nēweta ọnyà: Ma onye nātukwasi Jehova obi, agēme ka ọ nọ n'elu.
    Ilu 29:25
  • Rigo n'elu ugwu di elu, gi nwanyi nēzisa ozi ọma, bú Zaion; welie olu-gi n'ike, gi nwanyi nēzisa ozi ọma, bú Jerusalem; welie ya, atula egwu; si obodo nile nke Juda, Le, Chineke-unu!
    Aisaia 40:9
  • Onye-nwe-ayi, bú Jehova, enyewom ire nke ndi-nmuta, ka m'we mara iwere okwu kwagide onye dara #mbà: Ọ nākpọte ntim kwa-ututu, Ọ nākpọte ntim inu ihe dika ndi-nmuta.
    Aisaia 50:4
  • Jehova we sim, Asila, Nwata ka m'bu: n'ihi na ọ bu onye ọ bula M'gēzì gi ka i gējekuru, ọ bu kwa ihe ọ bula M'genye gi n'iwu ka i gēkwu.
    Jeremaia 1:7
  • Dika nkume adamant nke di ike kari ọmu, otú a ka M'meworo egedege-iru-gi: atula egwu ha, atu-kwa-la ujọ iru-ha, n'ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu.
    Ezikiel 3:9
  • Unu onwe-unu bu ìhè nke uwa. Apughi izo obodo nke ewuworo n'elu ugwu. Ma ha adighi-amuye oriọna, dọba ya n'okpuru mb͕é, kama n'elu ihe-idọba-oriọna; ọ nēnwu-kwa-ra madu nile nọ n'ulo ahu. Otú a menu ka ìhè-unu nēnwu n'iru madu, ka ha we hu ọlu ọma nile unu, we to Nna-unu Nke bi n'elu-igwe.
    Matiu 5:14-16
  • N'ihi na onye ọ bula ihere Mu onwem na okwum nile gēme n'ọb͕ọ a nke nākwa iko, nke nēmehie kwa, ihere onye ahu gēme kwa Nwa nke madu, mb͕e Ọ gābia n'ebube nke Nna-Ya, Ya na ndi mọ-ozi-Ya di nsọ.
    Mak 8:38
  • Ma unu gānata ike, mb͕e Mọ Nsọ gābiakwasiwori unu: unu gābu kwa ndi-àmàmnime Jerusalem, na nime Judia na Sameria nile, ru kwa ebe uwa sọturu.
    Ọlu Ndi-Ozi 1:8
  • Ma mb͕e ha huru nkwuwa-okwu nke Pita na Jọn, mb͕e ha ghọta-kwa-ra na ha bu ndi nāmaghi ihe na ndi nāmutaghi akwukwọ ri nne, o ju ha anya; ha we mata ha, na ha na Jisus anọwori.
    Ọlu Ndi-Ozi 4:13
  • Ma Pita na ndi-ozi zara, si, Ayi aghaghi ikweyere Chineke kari madu.
    Ọlu Ndi-Ozi 5:29
  • N'ihi na ihere ozi ọma ahu adighi-emem: n'ihi na ọ bu ike nke Chineke rue nzọputa nye onye ọ bula nke kwere; onye-Ju na mbu, na onye-Grik kwa.
    Ndi Rom 1:16
  • nēkpe kwa ekpere n'ihim, ka ewe nyem okwu n'isaghe ọnum, iwere nkwuwa-okwu me ka madu mara ihe-omimi nke ozi ọma, nke m'bu ukọ̀ nime nkpọrọ n'ihi ya; ka m'we kwuwa okwu nime ya, dika m'nāghaghi ikwu.
    Ndi Efesọs 6:19, 20
  • kama dika Chineke nwaputaworo ayi ka enye ozi ọma Ya n'aka-ayi na ntukwasi-obi idebe, otú a ka ayi nēkwu; ọ bughi dika ndi nēme ihe gātọ madu utọ, kama dika ndi nēme ihe gātọ Chineke utọ, bú Onye nānwa obi-ayi.
    I. Ndi Tesalọnaika 2:4
  • Ya mere ka ihere àmà nke Onye-nwe-ayi, ma-ọbu ihere nke mu onye-nkpọrọ-Ya, ghara ime gi: kama so ozi ọma Ya hujukọ anya dika ike nke Chineke si di;
    II. Timọti 1:8
  • Nēkwu ihe ndia, were kwa ha nādusi ọdu ike, were kwa ha nātu madu nmehie-ha n'anya, n'inye iwu nile. Ka madu ọ bula ghara ilelì gi anya.
    Taitọs 2:15
  • nēbinu obi-unu nke-ọma n'etiti ndi mba ọzọ; ka ha we site n'ọlu ọma nile unu, nke ha nēle anya, nye Chineke otuto n'ubọchi nleta ahu nime ihe ahu ha nēkwutọ unu nime ya dika ndi nēme ihe ọjọ.
    I. Pita 2:12