Amamihe


  • ọ si ndi-ikpe, Lenu ihe unu onwe-unu nēme: n'ihi na ọ bughi madu ka unu nēkpere ikpe, kama ọ bu Jehova; Ọ nọye-kwa-ra unu n'okwu ikpe-unu.
    II. Ihe Emere 19:6
  • Jehova, dubem n'ezi omume-Gi n'ihi ndi nēchem anwu; Me ka uzọ-Gi zie ezi n'irum.
    Abù Ọma 5:8
  • Jehova, me ka m'mara uzọ-gi nile; Zím okporo-uzọ-Gi nile. Mem ka m'zọ ije n'ezi-okwu-Gi, Gi zíkwam ihe; N'ihi na Gi onwe-gi bu Chineke nke nzọputam; Gi ka m'nēle anya Gi ogologo ubọchi nile.
    Abù Ọma 25:4,5
  • Ọ nēme ka ndi di ume-ala n'obi zọ ije n'ikpé: Ọ nēzi kwa ndi di ume-ala n'obi uzọ-Ya.
    Abù Ọma 25:9
  • Jehova, zím uzọ-Gi; Durukwam n'okporo-uzọ di lari, N'ihi ndi nēchem anwu.
    Abù Ọma 27:11
  • M'gēme ka i nwe uche, M'gēzi kwa gi ihe n'uzọ nke i gēje ije nime ya: M'gādu gi ọdu, anyam gādikwasi kwa gi n'aru.
    Abù Ọma 32:8
  • Site n'aka Jehova ka emeworo ka nzọ-ukwu nile nke madu guzosie ike; Uzọ-ya nātọ kwa Ya utọ.
    Abù Ọma 37:23
  • I gēji ndum-ọdu-Gi nēdum, Emesia I gēji kwa nsọpuru naram.
    Abù Ọma 73:24
  • Kpughepu anyam abua, ka m'we legide Oké ihe di iche iche si n'iwu-Gi puta.
    Abù Ọma 119:18
  • Okwu-Gi bu oriọna diri ukwum, Ọ bu kwa ìhè diri okporo-uzọm.
    Abù Ọma 119:105
  • Nkpughepu okwu-Gi nile nēnye ìhè; Ọ nēmeka ndi nēnweghi uche ghọta ihe.
    Abù Ọma 119:130
  • Mem ka m'nuru ebere-Gi n'ututu; N'ihi na Gi ka m'tukwasiworo obi: Mem ka m'mara uzọ nke m'gēje ije nime ya; N'ihi na Gi ka m'buliworo nkpuru-obim nye.
    Abù Ọma 143:8
  • Zím ime ihe di Gi utọ; n'ihi na Gi onwe-gi bu Chinekem: Mọ-Gi di nma; durum n'ala di lari. N'ihi aha-Gi, Jehova, me ka m'di ndu: N'ezi omume-Gi me ka nkpuru-obim puta n'ahuhu.
    Abù Ọma 143:10, 11
  • Ka onye mara ihe we nu, we tukwasi ihe-nmuta n'amam-ihe-ya; Ka onye-nghọta we nweta kwa ezi ndum-ọdu:
    Ilu 1:5
  • Itọrọ amam-ihe nti-gi n'ala, We wezuga obi-gi inwe nghọta; E, ọ buru na ọ bu nmata ka i nākpọku, Ọ buru kwa na ọ bu nghọta ka i nēweliri olu-gi; Mb͕e ahu ka i gāghọta egwu Jehova, Ọ bu kwa ihe-ọmuma Chineke ka i gāchọta. N'ihi na Jehova nēnye amam-ihe; N'ọnu-Ya ka ihe-ọmuma na nghọta si aputa:
    Ilu 2:3, 5, 6
  • Tukwasi Jehova obi-gi nile, Adabere-kwa-la nghọta-gi: N'uzọ-gi nile mara Ya, Ya onwe-ya gēme kwa ka okporo-uzọ-gi nile zie ezi.
    Ilu 3:5,6
  • Mb͕e i nējeghari, ọ ganēdu gi; Mb͕e i nēdina ala, ọ ganēche gi; Mb͕e i teta-kwa-ra, nke ahu gēso gi kparia uka.
    Ilu 6:22
  • Uzọ nke onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya ziri ezi n'anya ya onwe-ya: Ma onye nēge nti ndum-ọdu ka onye mara ihe bu.
    Ilu 12:15
  • Madu nwe ido obi n'usoro: Ma n'aka Jehova ka ọziza ire sitere.
    Ilu 16:1
  • Nuru ndum-ọdu, nara kwa idọ-aka-na-nti, Ka i we mara ihe n'ikpe-azu-gi.
    Ilu 19:20
  • Èchìchè nile nēji ndum-ọdu guzosi ike: Gi were kwa ezi ndum-ọdu bue agha.
    Ilu 20:18
  • N'ihi na ezi ndum-ọdu ka i gēji eburu onwe-gi agha: Ọzọ, nzọputa di n'ọtutu ndi nādu ọdu.
    Ilu 24:6
  • Ndi ọjọ adighi-aghọta ikpé: Ma ndi nāchọ Jehova nāghọta ihe nile.
    Ilu 28:5
  • Mọ nke Jehova gēnwe kwa ọnọdu-Ya n'aru ya, bú Mọ nke amam-ihe na nghọta, Mọ nke ndum-ọdu na idi-ike, Mọ nke ihe-ọmuma na egwu Jehova; ọzọ, ihe nātọ ya utọ bu egwu Jehova: ọ bughi kwa dika anya-ya abua si ahu ka ọ gēkpe ikpe, ọ bughi kwa dika nti-ya abua si anu ka ọ gāba nba:
    Aisaia 11:2, 3
  • M'ga-eme kwa ka ndi-ìsì je ije n'uzọ ha nāmaghi; n'okporo-uzọ ha nāmaghi ka M'gēme ka ọchichiri buru ìhè n'iru ha, me kwa ebe b͕agọrọ ab͕agọ ka ha guzozie. Ihe ndia ka M'gēme, M'gaghi-arapu kwa ha.
    Aisaia 42:16
  • Onye-nwe-ayi, bú Jehova, enyewom ire nke ndi-nmuta, ka m'we mara iwere okwu kwagide onye dara #mbà: Ọ nākpọte ntim kwa-ututu, Ọ nākpọte ntim inu ihe dika ndi-nmuta.
    Aisaia 50:4
  • Jehova ganēdu kwa gi mb͕e nile, me ka afọ ju nkpuru-obi-gi n'ebe nile nkpọrọ nku, Ọ gēme kwa ka ọkpukpu-gi nile di ike; i gādi kwa ha ubi ab͕ara ogige nke dere miri nke-ọma, di kwa ka ebe miri nāsuputa nke miri-ya nādighi-ata ata.
    Aisaia 58:11
  • Jehova, amawom na ọ bughi n'aka ya onwe-ya ka uzọ madu di: ọ bughi onye ọ bula nke nēje ije nwe ime ka nzọ-ukwu-ya guzosie ike.
    Jeremaia 10:23
  • N'ikwa-ákwá ka ha gābia, ọ bu kwa n'aririọ-amara nile ka M'gēduru ha: M'gēme ka ha jerue iyi di iche iche juputara na miri, n'uzọ ziri ezi, nke ha nāgaghi-asu ngọngọ nime ya: n'ihi na aghọworom Israel nna, ma Efraim, ọkparam ka ọ bu.
    Jeremaia 31:9
  • Ma umu-okoro anọ ndia, Chineke nyere ha ọmuma-ihe na uche n'akwukwọ na amam-ihe nile: Daniel ghọta-kwa-ra ọhù na nrọ nile.
    Daniel 1:17
  • Unu elela iru kpe ikpé, kama nēkpenu ikpé ziri ezi.
    Jọn 7:24
  • Nka bu ub͕ò nke-atọ m'nābiakute unu. N'ọnu ndi-àmà abua ma-ọbu atọ ka agēme ka okwu nile ọ bula guzo.
    II. Ndi Kọrint 13:1
  • Ma ọ buru na amam-ihe fọduru onye ọ bula nime unu inwe, ya riọ n'aka Chineke, Onye nēnye madu nile n'afọ-ofufọ, nātaghi kwa uta; agēwere kwa ya nye ya.
    Jemes 1:5
  • Ma amam-ihe ahu nke si n'elu bia buru uzọ di ọcha, emesia ọ di udo, nwe obi-ọma, nēkweye okwu nke-ọma, juputa n'ebere na ezi nkpuru, nēnweghi obi-abua, nēnweghi iru-abua.
    Jemes 3:17