Ụmụaka


  • i gējisi kwa ike izí ha-umu-gi, i gēkwu kwa okwu bayere ha mb͕e i nānọdu n'ulo-gi, na mb͕e i nēje ije n'uzọ, na mb͕e i nēdina ala, na mb͕e i nēbili ọtọ.
    Deuteronomi 6:7
  • Riba okwu ndia nile ama, nu kwa ha, bú nke mu onwem nēnye gi n'iwu, ka ọ we diri gi nma, di-kwa-ra umu-gi gānọchi gi rue mb͕e ebighi-ebi, mb͕e i nēme ihe di nma nke ziri ezi n'anya Jehova, bú Chineke-gi.
    Deuteronomi 12:28
  • o we si ha, Tukwasi obi-unu n'okwu nile nke mu onwem nāb͕ara unu àmà ta; nke unu gēnye umu-unu n'iwu, ka ha lezie anya ime okwu nile nke iwu a. N'ihi na ọ bughi ihe efu ka ọ bu n'ebe unu nọ; n'ihi na nka bu ndu-unu, ọ bu kwa ihe a ka unu gēwere me ka ubọchi-unu di anya n'elu ala, ebe unu onwe-unu nāgabiga Jọdan inweta ya.
    Deuteronomi 32:46,47
  • M'we hu, bilie, si ndi amara aha-ha, si kwa ndi nọchiri anya eze, si kwa ndi-ayi fọduru, Unu atula egwu ha: chetanu Onye-nwe-ayi, Nke di uku di kwa egwu, bu-kwa-ranu umu-nne-unu, na umu-unu ndikom, na umu-unu ndinyom, na ndinyom-unu, na ulo-unu, agha.
    Nehemiah 4:14
  • Bianu, umum, gem nti: Egwu Jehova ka m'gēzi unu.
    Abù Ọma 34:11
  • Gini ka okorọbia gēji me ka uzọ-ya di ọcha? Ọ bu n'ilezi ya anya dika okwu-Gi si di.
    Abù Ọma 119:9
  • That our sons may be as plants grown up in their youth; that our daughters may be as corner stones, polished after the similitude of a palace:Mb͕e umu-ayi ndikom di ka ihe akuru n'ala, ndi anēme ka ha bùe ibù mb͕e ha di na nwata; Umu-ayi ndinyom di ka ogidi nkuku ulo atuworo akika dika ihe-atù nke ulo uku;
    Abù Ọma 144:12
  • Nwam, echezọla iwum; Ma ka obi-gi chebe ihe nile m'nyere n'iwu:
    Ilu 3:1
  • N'ihi na onye Jehova nāhu n'anya ka Ọ nābara nba; Ọbuná dika nna si abara nwa-ya nke ihe-ya nātọ ya utọ nba.
    Ilu 3:12
  • O we zím ihe, sim, Ka obi-gi jide okwum nile; Debe ihe nile m'nyere n'iwu, we di ndu: Nweta amam-ihe, nweta nghọta; Echezọla, esi-kwa-la n'okwu nile nke ọnum wezuga onwe-gi:
    Ilu 4:4,5
  • Ma ub͕u a, umum, genum nti: N'ihi na ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi nēdebe uzọm nile bu. Nurunu idọ-aka-na-nti, we mara ihe, Unu eze-kwa-la ya ndu.
    Ilu 8:32-33
  • Onye nēb͕ochi nkpa-n'aka-ya nākpọ nwa-ya asì: Ma onye nāhu ya n'anya nādọsi ya aka na nti ike.
    Ilu 13:24
  • Dọ nwa-gi aka na nti, n'ihi na olile-anya di; Atukwasi-kwa-la obi-gi n'ime ka ọ nwua.
    Ilu 19:18
  • Onye ezi omume nke nējeghari n'izu-okè-ya, Ndi ihe nāgara nke-ọma ka umu-ya nke gānọchi ya gābu.
    Ilu 20:7
  • Zulite nwata dika uzọ-ya si di, Ọbuná mb͕e o mere okenye ọ gaghi-esi nime ya wezuga onwe-ya
    Ilu 22:6
  • Uche b͕agọrọ ab͕agọ bu ihe ekekọtaworo n'obi nwata; Ma nkpa-n'aka nke idọ-aka-na-nti gēme ka ọ di anya n'ebe ọ nọ.
    Ilu 22:15
  • Eb͕ochila idọ-aka-na-nti n'aru nwata: Mb͕e i gēji nkpa-n'aka tie ya, ọ gaghi-anwu.
    Ilu 23:13
  • Ọzọ, umu-gi nile gābu ndi-nmuta Jehova; udo nke umu-gi gāba kwa uba.
    Aisaia 54:13
  • Ya mere mb͕e ha risiri nri-ututu-ha, Jisus si Saimon Pita, Saimon, nwa Jọn, ì hurum n'anya kari ndia? Ọ si Ya, E, Onye-nwe-ayi; Gi onwe-gi matara na I bu eyìm. Ọ si ya, Nēnye umu-aturum nri.
    Jọn 21:15
  • Ndi bu nna, akpasu-kwa-la umu-unu iwe: kama nāzùputa ha n'ọzùzù na idu-ọdu nke Onye-nwe-ayi.
    Ndi Efesọs 6:4
  • Ndi bu nna, akpasula umu-unu iwe, ka obi ghara ifù ha.
    Ndi Kọlọsi 3:21
  • onye nāchi èzí-na-ulo nke aka ya nke-ọma, nēnwe kwa umu-ya n'okpuru ya n'ikwesi-nsọpuru nile;
    I. Timọti 3:4
  • Ihe nile i nukwara n'ọnum site n'etiti ọtutu ndi-àmà, nye ihe ndia n'aka madu ndi kwesiri ntukwasi-obi idebe, bú madu ndi ọ gēkwe kwa izí madu-ibe-ha ihe ndia.
    II. Timọti 2:2
  • Ma nāb͕anari agu ihe ọjọ nāgu nwa-okorọbia, nāb͕aso kwa ezi omume, okwukwe, ihu-n'anya, udo, gi na ndi nākpọku Onye-nwe-ayi site n'obi di ọcha.
    II. Timọti 2:22
  • unu echezọsiwo kwa okwu nkasi-obi ahu, nke nāgwa unu okwu dika anāgwa umu-ndikom, si, Nwam, agula ya n'ihe ntà, bú ozizí Onye-nwe-ayi nēzí gi site n'inye gi ahuhu, Ada-kwa-la #mbà mb͕e Ọ nātu gi nmehie-gi n'anya; N'ihi na onye Onye-nwe-ayi huru n'anya ka Ọ nēzí ihe site n'inye ya ahuhu, O nāpia kwa nwa ọ bula Ọ nānata utari. Nātachinu obi ka ewe zí unu ihe site n'inye unu ahuhu; n'ihi na Chineke nēmeso unu dika umu; n'ihi na ònye bu nwa ahu nna-ya nādighi-ezi ya ihe site n'inye ya ahuhu? Ma ọ buru na adighi-ezí unu ihe site n'inye unu ahuhu, nke emeworo unu niile ka ha buru ndi-nketa, ya mere unu bu umu iko, unu abughi kwa umu n'ezie. Ọzọ kwa, ayi nwere ndi bu nna nke anu-aru-ayi izí ayi ihe site n'inye ayi ahuhu, ayi we sọpuru ha: àyi agaghi-edo kari onwe-ayi nke-uku n'okpuru Nna nke mọ-ayi, we di ndu?
    Ndi-Hibru 12:5-9
  • Enweghm ọṅù nke ka ihe ndia uku, bú inu ka umu nke akam nējeghari n'ezi-okwu ahu.
    3 Jọn 1:4