Ịkwụwa aka ọtọ


  • Ihe-osìsì aghughọ bu ihe-árú n'anya Jehova: Ma nkume-isì-ihe zuru ezu bu ihe nātọ Ya utọ. Izu-okè nke ndi ziri ezi nēdu ha: Ma omume b͕agọrọ nke ndi nāghọb͕u aghọb͕u gēmebi ha.
    Ilu 11:1,3
  • Na njehie nke eb͕ub͕ere-ọnu ka ọnyà onye ọjọ di: Ma onye ezi omume gēsi n'ahuhu puta. Onye nēkupu ikwesi-ntukwasi-obi dika ume nēgosi ezi omume, Ma onye-àmà okwu-ugha nēgosi aghughọ.
    Ilu 12:13,17
  • Onye nēkpuchi njehie-ya nile, ọ gaghi-agara ya: Ma onye nēkwuputa ha, nke nārapu kwa ha, agēnwe obi-ebere n'aru ya.
    Ilu 28:13
  • Unu enyeghachila onye ọ bula ihe ọjọ n'ọnọdu ihe ọjọ. Burunu uzọ nēchè ihe ọma n'iru madu nile.
    Ndi Rom 12:17
  • Unu enyeghachila onye ọ bula ihe ọjọ n'ọnọdu ihe ọjọ. Burunu uzọ nēchè ihe ọma n'iru madu nile.
    II. Ndi Kọrint 4:2
  • n'ihi na ayi buru uzọ nēchè ihe ọma, ọ bughi nání n'iru Onye-nwe-ayi, kama n'iru madu kwa.
    II. Ndi Kọrint 8:21
  • unu ekwula okwu-ugha gwarita ibe-unu; ebe unu yipuchasiworo madu ochie ahu, ya na omume-ya nile,
    Ndi Kọlọsi 3:9
  • Ya mere, nēkwuputanu nmehie nile unu gwarita ibe-unu, nēkpe kwa ekpere n'ihi ibe-unu, ka ewe me ka aru di unu ike. Aririọ nke onye ezi omume di ike nke-uku n'ilusi-ọlu-ike-ya.
    Jemes 5:16