Ọgwụgwọ


  • si, Ọ buru na i ge nti nke-ọma n'olu Jehova, bú Chineke-gi, ọ buru kwa na i me ihe nke ziri ezi n'anya-Ya, ọ buru kwa na i ṅa nti n'ihe Ọ nyere n'iwu, ọ buru kwa na i debe ukpuru-Ya nile, ọ dighi ọria ọ bula nke M'tiyere n'aru ndi Ijipt M'gētiye n'aru gi: n'ihi na Mu onwem bu Jehova Nke nēme ka aru di gi nma.
    Ọpupu 15:26
  • Jeghachi, si Hezekaia, bú onye-ndú ndim, Otú a ka Jehova, bú Chineke Devid nna-gi, siri, Anuwom ekpere-gi, ahuwom anya-miri-gi: le, M'nēme ka aru-gi di ike: n'ubochi nke-atọ i gārigoru ulo Jehova.
    II. Ndi-Eze 20:5
  • Ha di ọtutu, bú ihe ọjọ nke nādakwasi onye ezi omume: Ma n'aka ha nile ka Jehova nānaputa ya.
    Abù Ọma 34:19
  • Bú Onye nāb͕aghara gi ajọ omume-gi nile; Onye nāgwọ ọria-gi nile;
    Abù Ọma 103:3
  • O nēzite okwu-Ya, we me ka aru di ha nma, O nēme kwa ka ha si n'olùlù nile ha wepuga onwe-ha.
    Abù Ọma 107:20
  • Ọ bu Onye nēnye onye dara #mbà ike; onye ike nādighi ka Ọ nēme kwa ka ọ nwe ume n'uba.
    Aisaia 40:29
  • Ma ya onwe-ya bu onye amapúworo site na njehie nile nke ayi, onye azọpiaworo site n'ajọ omume nile nke ayi: ahuhu-nmehie nke udo-ayi di n'aru ya; ọ bu kwa ubiri-utari-ya ka ejiri me ka aru-ayi di ike.
    Aisaia 53:5
  • N'ihi na M'gēme ka anu-aru ọhu puchie n'aru gi, M'gāgwọpu kwa gi n'ọnyá-gi nile etiputara, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); n'ihi na Nwanyi achupuru achupu ka ha kpọworo gi, si, Zaion ka ọ bu, ọ dighi onye nāchọ ya.
    Jeremaia 30:17
  • Ma unu ndi nātu egwu aham ka anyanwu nke ezi emume gāwara, ọgwugwọ di kwa na nkù; unu gāpu kwa, wulie elu dika umu-ehi nke ulo ebe anēme ka anu ma abuba.
    Malakai 4:2
  • Owe kpọ ndikom iri na abua ahu ndi nēso uzọ-Ya ka ha biakute Ya, O nye ha ike n'ebe ndi-mọ nādighi ọcha nọ, ichupu ha, na igwọ ọria nile di iche iche na nriaria nile di iche iche.
    Matiu 10:1
  • Ihe-iriba-ama ndia gēso kwa ndi kwere: n'aham ka ha gāchupu ndi-mọ ọjọ; ha gēkwu okwu n'asusu ọhu di iche iche; ha gāchilite agwọ, ọ buru kwa na ha aṅua ihe ọ bula nēbute ọnwu, ọ gaghi emeru ha aru ma-ọli; ha gēbikwasi ndi-nriaria aka, agēme kwa ka aru-ha di ike.
    Mak 16:17-18
  • Mb͕e Ọ huru ha, O we si ha, Ganu, were onwe-unu gosi ndi-nchu-àjà. O we rue, mb͕e ha nāga, na emere ka aru-ha di ọcha.
    Luk 17:14
  • Pita we si ya, Ineas, Jisus Kraist nēme gi ka aru di gi ike: bilie, dozi kwa ute nke gi. Ngwa ngwa o we bilie.
    Ọlu Ndi-Ozi 9:34
  • N'ihi ọkika nke nkpughe ndia-n'ihi ya, ka ewe ghara iwelibigam ókè, enyerem ogwu n'anu-arum, bú mọ-ozi nke Setan, ka o we tiem aka, ka ewe ghara iwelibigam ókè. Ub͕ò atọ ka m'riọrọ Onye-nwe-ayi aririọ bayere ihe a, ka ọ pua n'arum. Ọ siwokwam, Amaram ezuworo gi: n'ihi na emewo ka ikem zu oké n'adighi-ike. Ya mere kama ihe ọzọ m'gēwere obi-utọ nile nya isi n'adighi-ikem nile, ka ike nke Kraist we ridakwasim, biri kwa nimem.
    II. Ndi Kọrint 12:7-9
  • kwa-kwa-ranu ukwu-unu uzọ nke nēguzozi ọtọ, ka ewe ghara ime ka ukwu nke di ngwurọ kwopu, kama ka ewe me ka ọ di ike.
    Ndi-Hibru 12:13
  • Ọ̀ di onye ọ bula n'etiti unu nke aru-ya nādighi ike? ya kpọ ndi-okenye nke nzukọ Kraist ka ha biakute ya; ka ha kpe kwa ekpere n'isi-ya, nēte ya manu olive n'aha Onye-nwe-ayi: ekpere nke okwukwe ahu gāzọputa kwa onye ahu aru nādighi ike, Onye-nwe-ayi gēme kwa ka o bilie; ọ buru kwa na o mehieworo, agāb͕aghara ya nmehie ahu. Ya mere, nēkwuputanu nmehie nile unu gwarita ibe-unu, nēkpe kwa ekpere n'ihi ibe-unu, ka ewe me ka aru di unu ike. Aririọ nke onye ezi omume di ike nke-uku n'ilusi-ọlu-ike-ya.
    Jemes 5:14-16