Uto Ime Mmụọ


  • N'ihi na Ọ mawo uzọ m'nāga; Mb͕e Ọ nwaputasirim, dika ọla-edo ka m'gāputa.
    Job 23:10
  • N'ihi na Ọ mawo uzọ m'nāga; Mb͕e Ọ nwaputasirim, dika ọla-edo ka m'gāputa.
    Abù Ọma 40:3
  • N'ihi na onye Jehova nāhu n'anya ka Ọ nābara nba; Ọbuná dika nna si abara nwa-ya nke ihe-ya nātọ ya utọ nba.
    Ilu 3:12
  • Ewe bibie ihe onye ahu ji urọ akpu n'aka ọkpu-ite ahu, o we kpu kwa ya ọzọ ihe di iche, dika o ziri ezi n'anya ọkpu-ite ahu ikpu ya.
    Jeremaia 18:4
  • Obi-gi, ò gēguzo? ma-ọbu aka-gi abua, hà gādi ike n'ubọchi ndia mb͕e Mu onwem nēmeso gi? Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo, me kwa ya.
    Ezikiel 22:14
  • M'gēnye kwa unu obi ọhu, ọ bu kwa mọ ọhu ka M'gētiye nime unu: M'gēwezuga kwa obi nkume n'anu-aru-unu, nye unu obi nke bu anu-aru.
    Ezikiel 36:26
  • Ya mere onye ọ bula nke nānu okwum ndia, nēme kwa ha, agēji ya tuyere nwoke nwere uche, onye wuru ulo-ya n'elu oké nkume:
    Matiu 7:24
  • Ha adighi-ab͕aye kwa manya-vine ọhu na karama-akpukpọ ochie: eme otú a, karama-akpukpọ ahu ab͕awa, manya-vine ahu we wusì, karama-akpukpọ ahu ala kwa n'iyì: ma ha nāb͕aye manya-vine ọhu na karama-akpukpọ ọhu, anēdebe ha abua nke-ọma.
    Matiu 9:17
  • For unto whomsoever much is given, of him shall be much required: and to whom men have committed much, of him they will ask the more.ma onye nāmaghi, me kwa ihe kwesiri ihe-otiti, agāpia ya utari ole-na-ole. Ọzọ, onye ọ bula enyere ihe uku, n'aka-ya ka agāchọ kwa ihe uku: onye ha nye-kwa-ra ihe uku n'aka idebe, n'aka-ya ka ha gāju ihe nke ka.
    Luk 12:48
  • Saimon, Saimon, le, Setan riọtara unu, ka ọ yọcha unu dika ọka: ma Mu onwem riọrọ aririọ bayere gi, ka okwukwe-gi ghara igwu agwu: gi-onwe-gi, mb͕e i gēchighariwori, gi me kwa ka umu-nna-gi guzosie ike.
    Luk 22:31, 32
  • Ya onwe-ya aghaghi idi nāba uba, ma aghaghm idi nāla alà.
    Jọn 3:30
  • N'ezie, n'ezie, asim unu, Ọ buru na nkpuru ọka adaghi n'ala we nwua, nání ya onwe-ya nānọgide; ma ọ buru na ọ nwuru, ọ mia ọtutu nkpuru.
    Jọn 12:24
  • Alaka ọ bula nimem nke nādighi-ami nkpuru, O wepu ya: alaka ọ bula nke nāmi nkpuru, O nēme kwa ya ka ọ di ọcha, ka o we mia nkpuru kari.
    Jọn 15:2
  • Nọgidenu nimem, Mu onwem kwa nime unu. Dika alaka nāpughi imi nkpuru n'onwe-ya, ọ buru na ọ nọgideghi n'osisi vine; otú a ka unu onwe-unu nāpughi, ọ buru na unu anọgideghi nimem.
    Jọn 15:4
  • Ya mere esitere na baptism-ayi likọ ayi na Ya ibà n'ọnwu ahu: ka, dika esitere n'ebube nke Nna-Ya me ka Kraist si na ndi nwuru anwu bilie, ka ayi onwe-ayi we jeghari kwa na ndu ọhu otú a.
    Ndi Rom 6:4
  • unu adi-kwa-la nēche ihe di unu n'aru n'iru nmehie ka ha buru ihe-agha ajọ omume; kama chenu onwe-unu n'iru Chineke, dika ndi sitere na ndi nwuru anwu di ndu, che-kwa-nu ihe di unu n'aru n'iru Chineke ka ha buru ihe-agha ezi omume.
    Ndi Rom 6:13
  • Ya mere, umu-nnam, ejim obi-ebere nile nke Chineke nāriọ unu, ka unu che aru-unu n'iru Chineke, dika àjà di ndu, di nsọ, nke di Chineke ezi utọ, nke bu ikpe-ekpere-unu dika uche si di.
    Ndi Rom 12:1, 2
  • Ọ dighi ọnwunwa ọ bula nwaworo unu ma-ọbughi nke madu nānagide: ma Chineke kwesiri ntukwasi-obi, Onye nāgaghi-ekwe ka anwa unu kari nke unu puru inagide; kama n'oge ọnwunwa ahu Ọ gēme kwa uzọ nb͕apu, ka unu we nwe ike inagide ya.
    I. Ndi Kọrint 10:13
  • N'ihi nka ike agwughi ayi n'obi; kama asi na ọ bu ezie na madu elu-aru ayi nēre uré, ma anēme ka madu ime ayi buru ihe ọhu kwa-ubọchi. N'ihi na nkpab͕u-ayi nke di nfé, nke di na nwa oge a, nāluputara ayi ebube nke-uku ri nne kachasi ihe nile, bú ebube nke di arọ́ di kwa ebighi-ebi;
    II. Ndi Kọrint 4:16, 17
  • Ya mere ọ buru na onye ọ bula di nime Kraist, ọ bu onye ekère ọhu: ihe ochie agasiwo; le, ha aghọwo ihe ọhu.
    II. Ndi Kọrint 5:17
  • N'ihi na ọ bu ezie na ayi nējeghari n'anu-aru, ma ayi adighi-ebu agha dika anu-aru si ebu: (n'ihi na ihe-agha nke ibu-agha-ayi abughi nke anu-aru, kama ha sitere na Chineke bu ihe puru ikwada ebe ewusiri ike);
    II. Ndi Kọrint 10:3, 4
  • Ọ siwokwam, Amaram ezuworo gi: n'ihi na emewo ka ikem zu oké n'adighi-ike. Ya mere kama ihe ọzọ m'gēwere obi-utọ nile nya isi n'adighi-ikem nile, ka ike nke Kraist we ridakwasim, biri kwa nimem. N'ihi nka adighi-ike nile na imem ihe-ihere nile na nkpà nile na nsob͕u nile na oké nkpà nile n'ihi Kraist dim ezi nma: n'ihi na mb͕e ọ bula m'nādighi ike, mb͕e ahu ka m'nādi ike.
    II. Ndi Kọrint 12:9, 10
  • ka eme kwa ka unu di ọhu na mọ nke uche-unu, ka unu yikwasi kwa madu ọhu unu, nke ekère dika Chineke chọrọ nime ezi omume na idi-ọcha nke ezi-okwu ahu.
    Ndi Efesọs 4:23, 24
  • ebe m'tukwasiworo obim n'otù ihe nka, na Onye malitere ilu ezi ọlu nime unu gāluzu ya rue ubọchi Jisus Kraist:
    Ndi Filipai 1:6
  • Umu-nnam, mu onwem agughi onwem na ejidewom rue ub͕u a: ma otù ihe ka m'nēme, ebe m'nēchezọ ihe nile di n'azu, nēsetipu kwa aka n'ebe ihe nile di n'iru di,4 anamab͕akuru ókè ib͕a-ọsọ ka m'we nata ihe anāb͕ata n'ọsọ nke ọkpukpọ di elu nke Chineke nime Kraist Jisus.
    Ndi Filipai 3:13, 14
  • Nāb͕asi nb͕a ọma nke okwukwe ike, jide ndu ebighi-ebi aka nke akpọrọ gi ka i nata ya, i kwuputa-kwa-ra nkwuputa ọma ahu n'iru ọtutu ndi-àmà.
    I. Timọti 6:12
  • Som hujukọ anya, dika onye-agha ọma nke Kraist Jisus.
    II. Timọti 2:3
  • Guanu ya n'ọṅù nile, umu-nnam, mb͕e ọ bula unu dabàra n'ọwunwa di iche iche; ebe unu mara na nnwaputa nke okwukwe-unu nāluputa ntachi-obi.
    Jemes 1:2, 3
  • Ya mere donu onwe-unu n'okpuru Chineke; ma guzogidenu ekwesu, ọ gāb͕apu kwa n'ebe unu nọ.
    Jemes 4:7
  • Nke obi nātọ unu utọ nke-uku nime ya, ọ bu ezie na emere ka o wuta unu n'ọnwunwa di iche iche nwa oge ub͕u a, ma asi na ọ di nkpà, ka nnwaputa nke okwukwe-unu, ebe ọ dikariri ọla-edo oké ọnu-ahia nke-uku, bú ọla-edo nke nāla n'iyì, ọ bu ezie na anēji ọku nwaputa ya, ka ewe hu nnwaputa ahu na ọ nēweta otuto na ebube na nsọpuru nime nkpughe nke Jisus Kraist:
    I. Pita 1:6, 7
  • Ndi m'huru n'anya, unu echèla èchichè bayere ọnwunwa ọku ahu nke di n'etiti unu, nke nābiakwasi unu inwa unu, na ọ bu ihe anāhughi mb͕e ọ bula, dika agāsi na ọ bu ihe anāhughi mb͕e ọ bula nādakwasi unu: kama ebe unu nwekọrọ ahuhu nke Kraist, nāṅurinu ọṅu; ka unu we were kwa obi nātọ utọ nke-uku ṅuria nime nkpughe nke ebube-Ya.
    I. Pita 4:12, 13